AuthorsDen.com   Join | Login    
Where Authors and Readers come together!

SIGNED BOOKS    AUTHORS    BOOKS    SAMPLE CHAPTERS    AUDIOBOOKS    eBOOKS    STORIES    ARTICLES    POETRY    BLOGS    NEWS    VIDEOS    SUCCESS    TESTIMONIALS

Featured Authors:  Martin Treon, iDr. Patrick ODougherty, iFERIAL Haque, iGwendolyn Thomas Gath, iMichael Gorton, iDavid Schwinghammer, iDeborah Frontiera, iFrances Altman, iPatricia Sims, iScott Zachary, i

  Home > Action/Thriller > Articles Popular: Books, Stories, Articles, Poetry      Authors: A B C D E F G H I J K L M N O P Q R S T U V W X Y Z     
Nwokedi Chiemezie Felix

 Follow Me  

· Contact Me
· Articles
· Poetry
· 11 Titles
· 1 Reviews
· Save to My Library
· Share with Friends!
·
Member Since: Nov, 2010

Nwokedi Chiemezie Felix, click here to update your pages on AuthorsDen.


NHAZI AKOMAKO/NKOWA OFUFE NRU EZI FRAIDE
by Nwokedi Chiemezie Felix   
Not "rated" by the Author.
     
Recent articles by
Nwokedi Chiemezie Felix

• THE FAITH OF JESUS CHRIST: AN ANTIDOTE TO CONTEMPORARY CHRISTIANITY
• CHALLENGES OF AFRICAN TRADITIONAL RELIGION TO THE CHRISTIAN FAITH IN NIGERI
• Palm Sunday Commentary for Year C
• THE AUTHENTICITY OF THE CATHOLIC SAINTHOOD?
• STAGES ON THE LIFE'S WAY: QUEST FOR THE INDIVIDUAL AUTHENTICITY
           >> View all

NHAZI AKOMAKO/NKOWA OFUFE NRU EZI FRAIDE

NHAZI AKOMAKO/NKOWA OFUFE NRU EZI FRAIDE

                                                                                                  Maazi Nwokedi Felix C dere ya

Ekwe kuo, ama agbaa. Ezuo ka aha eri udele , atotuo ngiga.

Ya bu, Ezi na ulo chukwu nhuru na anya otito dirinu Jesu Kristi bido ugbua rue mgbe ebighibi. Amen.

O bu nnukwu obi anuri nke na-enweghi atu ka n jiri were na-anabata onye obula na nnukwu emume nke tata. Oburu na-ebugharia egwu, a ga-ebugharikwa onodu. Kegbe unyahu ka Uka jiri were nodu na nnukwu ogbaghara na nwute n’ihi na Onyenweanyi aghaghi inu iko nke nna nyere ya.

Ubochi uka, anyi kara uka omu were nodu na ya gosiputa mbanye puru iche nke Dinwenu anyi banyere na Jerusalem. Egosiputakwara anyi etu ndi mmadu siri were na echekwa ya n’ihi na gidigidi bu ugwu eze tinyekwaziere na ugwu eze bu ndi ona na-achi. Unyahu bu Toozde di aso, anyi niile gbakoro ma mekwaa emume odido edoro Yukaristia di Aso, nwube ndi ukochukwu nke Jeso noro na ya saa ndi umu azu ya ukwu. Anyi jizi emume ibupu na isekpuru Yukaristia di aso opekata mpe otu awa were piachiko emume unyahu.

 

Tata, na agbanyeghi na anya mmiri okenye na-acha nzu nzu , otu ndi ahu toro Jeso mana ekwe hosanna ga-abiakwazie mewaa ya obi. Tata bu Ezi Fraide, Uka na-eme nnukwu emume nke ncheta na onwu Kristi. Obu maka na egbugberenu adighimma ka o noro ka mmiri maa eze mere Jesu jiri taa ahuhu, nwuo ma bilite n’onwu iji wee gbaputa anyi na ohu nke njo ma dozie agbata diri mmadu na chineke.

 

Emume tata na-eche n’ihu anyi, ihe mere dika puku afo abuo na iri na abuo gara aga. Dika anyi magoru, ofufe nru Latin/Rome na- akpo tata Ezi Fraide. Ofufe nru Greek were tata dika ‘he hagia  kai megale paraskeue’ nke putara Fraide di aso ya na nnukwu Fraide. ‘Paraskeue’  putara nkwado puru iche a na-eme n’ubochi nke isii maka emume nke Sabath.

N’oge uhuruchi , ebe obu na ubochi ahu bu ubochi nkwa debe ga bu ubochi na-abota ubochi Sabath Joseph onye Arimatia …..kara obi gakwuru Pailet rio ya ka oburu ahu Jesu.(Mk. 15:42-43)

 Ndi Germany na-ewere tata dika ‘charfreitag’ nke putara Fraide Afufu. Tertulian na Ireneus di aso kowaputara na tata bu nnukwu ubochi ngafere n’onwu nke Dinwenu. N’ezie, e jide ibe ji na aka, a saa a gu okwu, obu maka ihe iriba ama nke nzoputa anyi nke Jesu mere tata mere eji akpo ubochi tata, Ezi Fraide, Nnukwu Fraide maobu Fraide di Aso.

 

Tata bukwa soso ubochi anaghi ekwu Aja Missa di aso na nzuko Kristi. Agaghi acho ulo uka mma. Ekwu nchu aja (altar)ga-agbazi oto. Onu uzo tabanakul ga eghere oghe. Agaghi anu uda atanu (altar bell) ma obu nke mgbirigba egwu (musical instruments) obula. Ihe ndia putara bu na Onyenweanyi anoghi n’etiti ndi nke ya ugbua kama umu azu ya agbasasigo. Oputakwaziere na O jebego inu iko nke nna nyere Ya. Ya mere ‘Apostolic Constitution’ nke century nke ano jiri kpoo tata ubochi iru uju.

Obu ezie na-agaghi achu Aja Misa, Uka na-akpo emume Yucharistia a ga-eme tata “Mass of the Pre-sanctified” n’olu bekee. Ihe nke a putara bu na-obu Oriri Nso a goziri nyahu ka-aga anata tata.

 

Ndi be anyi siri na-adighi ahapu isi aka agba uriom. Nkea putara na okwu m agaghi ezu oke ma o buru na-emeghim ka unu mara na-ekere mmeme tata uzo ato:

v Emume nke okwu

v Emume nke isekpuru obe

v Inata oriri nso

 

Emume nke okwu

Dika n gwagoro anyi, agaghi acho ekwu nchu aja (altar) mma obula tata. Agaghi amunye oku obula n’etiti anyi. Ndi ukochukwu tinyere ndi n’agba odibo rute n’ebe nchu aja, ha ga-edinere ala nwantiti oge ebe ndi Uka ga-esekpuru ala kpee ekpere n’ime obi. Nke a na- egosiputa n’ emume tata abughi ‘ogu chere ka m bia.’

Ka nke a gachara, ndi ukochukwu ga aga n’oche ha. Onye isi emume ga eji ekpere mbido were bido emume a. Emesia nkea, onye obula ga anoro ala gee nti n’ihe ogugu abuo a ga-aguru anyi tinyere ekwe azaa. Emecha, anyi ga akwu oto were gere akuko maka ahuhu Dinwenu Jesu Kristi dika John siri dee ya. Agakwazi esite n’okwuchukwu nyejuo anyi nri nke mmuo afo n’ihi na-obu ekwughi okwu mere onu anughi anu eme nti. Aga ejizi ekpere nke ndi kwere nu were mechie emume nke okwu.

 

Emume nke Isekpuru Obe

Ebe nwata n’ebe akwa na-atu aka, nne ya anoghi, nna ya ga-ano ebe ahu. Ubochi tata bu soso ohere uka nyere anyi iji sekpuere obe n’ihi na-obu site n’obe Jeso ka anyi siri nweta mmeri.

Emume nke isekpuru obe malitere na Jerusalem ihe dika na century nke ano oge Helena di aso choputara /nwetakwa obe Jeso. Ofufe nru Latin /Rome gadoro aka n’obe a Helena di aso choputara were bidokwazie isekpuru obe di aso na century nke asaa.

Tata, ukochukwu ga-eburu obe nke ekechiri ekechi. Ndi na-gba odibo na-ebe nchuaja abuo ga-eburu oku oriona soro ya n’ihu. Ukochukwu tinyere ndi na-agba odibo ga-eburu obe a site n’azu ma biarute n’ebe nchuaja. Ukochukwu ga-anoro na mbata ulo uka were nwayo toghee akuku nke obe nke chebere ihu n’elu. O mesia nke a, o ga ekwu: leenu osisi nke obe, ebe akpogburu onye nzoputa nke uwa. Anyi ga azakwazi ya; Bianu ka anyi sekpuenu.

O gakwa atoghepu akuku aka nri nke obe ma orute n’etiti ulo uka ma kwue otu udi okwu ahu. N’ikpeazu, tupu obanye n’ebe nchuaja o ga atoghepu obe niile ma kwuo otu udi okwu ahu . Anyi ncha gakwazi aza ya nke oma. Emechaa nkea, a ga-edobezi obe a n’ihu ekwu nchu aja. Ndi nchu aja ga-esekpuere obe a ugboro ato ma gazie susuo ya onu iji gosi na obu site n’obe di aso ka Jeso siri zoputa anyi. Emesia nkea onye isi emume ga ebuli obe Jeso ma kpokuo anyi ka-anyi sekpuoro Obe. Isekpuru obe a gakwazi anochi anya isusu obe onu dika anyi sibu eme. Ka nkea na-eme, ndi ukwe ga na-ekwe ukwe akporo ‘improperia’ n’asusu Latin.  Iji kuzie nnukwu nkuzi banyere isekpuru obe ya na iji gbaziere ndi na-akoto ndi katolik na ha na esekpuru osisi, Pseudo Alcuin fere n’isi na ‘okenye agaghi anoro n’ulo, ewu amuo n’ogbu.’

Ya bu, ijiri wee naputa okuko mkpuru akwu, Pseudo Alcuin kwuru na Latin

Prosternimur corpore ante crucem, mente ante Dominum. Veneremur crucem, per quam redempti sumus, et illum deprecamur, qui redemit.

Nke a putara na bekee:

While we bend down in body before the cross, we bend down in spirit before God. While we reverence the cross as the instrument of our redemption, we pray to him who redeemed us .

Ndi nhuru n’anya, obe bu isi sekpu nti na-abum onye otu Kristi. Akara  nke obe n’edu anyi, akara nke obe bu mmeri anyi, n’osisi nke obe ka Kristi noro nwuo akara nke obe na-edu anyi.

N’ihi nkea , nna anyi oche n’okwukwe, Tertulian, mere ka anyi mata:

“in all our travels, in all our coming in and going out, in putting on our shoes , at the bath, at the table , we mark our foreheads with the sign of the cross.”

Oge etiri anyi mmirichukwu na oge edoro anyi ike n’okwukwe site na Sakramenti nke komfameshon, ejiri mmanu krism doo anyi akara nke obe n’egedege ihu. Na sakramenti nke odasi di aso ya na ite ndi oria ude nso, anakwazi esi na mmanu krism a kaa onye na-anata ya bu Sakramenti akara nke obe. Chetakwanu ubochi Weneezde ntu, ejiri ntu gbuo anyi akara nke obe n’egede ihu. Anyi gachaa nkwuputa, Ukochukwu ga-egbu akara obe iji gozie ma gbaghara anyi. Ukochukwu na-eji akara obe agozi mmadu na ihe ndi ozo oge obula, tinyekwara oge a na-ekwu Missa. Ihe ndia niile bu mmejuputa amuma Izikel:

Si ya, “ gaa gburugburu obodo Jerusalem niile ma kaa akara n’ihu ndi niile na-eru uju ma na-ebe akwa maka ihe ojoo nke na-eme na ya…unu enwekwala obi ebere obula n’ebe ndi okenye ndi nwoke, umu okorobia, ndi agadi, umuagbogho na umuaka no. gbuchapunu ma kpochapunu ha niile. Ma unu emetukwala onye obula nwere akara n’ihu ya aka…  (Iz 9:4)

 Ndi mhuru n’anya, lokene udi ihunanya a, Kristi were ndu ya nye maka ihi anyi. N’elu obe, ewere ube mapuo akuko ya, obara na mmiri asuputa. Dika nne si eji mmiri ara azu nwa, etua ka Kristi siri were obara ya kwuo ugwo njo anyi ma zoputa anyi na abum ohu nke njo. Maka ihi anyi, Dinwenu anyi rubere isi ruo n’onwu-burugodu onwu n’elu obe. Yabu na ike ama agwunata anyi isekpuru obe ya.

 

Emume nke Inata Oriri Nso:

Nke a bu ngalaba nke ato na nke ikpeazu n’emume nke tata. N’emume a nke uka kporo, ‘Mass of the Pre-sanctified’, a ga-anoro naya nata ma rie Oriri Nso nke agoziri unyahu. Enyechaa onyinye, a ga-ato akwa ocha n’ekwu nchuaja. A ga ebidozi na nna anyi no n’eligwe. Agaghi enye ekele nke udo. Anatasia Oriri ukochukwu ga ekpe ekpere anatasia Oriri Nso ma kpekwara ndi mmadu ekpere, onye obula ga-anaba n’enyeghi mkpotu obula maka na Onyenweanyi kozi n’elu obe n’ihi na onye ya na nwata kwuru rie nkoto ejula adighi mma ka o gonahu ya ubochi a ga-eri mpioro. Ka anyi chetakwanu, oburu na ndi ukochukwu biarute n’ebe nchuaja, ha ga edine ala, ebe anyiga-esekpuru ala ma nosie ike n’ekpere ime obi. Nkea gasia, Ukochukwu ga-eji ekpere bidoro anyi nnukwu emume nke a ga anoro na-ya cheta ahuhu na onwu Kristi. Ekpeecha ekperea, anyi ga-anodu ala gee nti n’ihe ogugu a ga- aguru anyi. Ka anyi gbaa mbo tinye onwe anyi niile n’emume a iji soro Kristi nwuo ma soro ya kulie. Yabu, ka ndi isi emume na-abiru nso, ka anyi kwuru oto iji gosiputa nkwenye na mmasi anyi na nnukwu ihe omimi nke nzoputa anyi.

 

1. Emume nke Okwu

Ihe Ogugu nke Mbu: (Is 52:13-53;12)

N’ihe ogugu a, Aizai buru amuma na onu gbara ogiri aso ga-emesia dere ogiri rachaa. O bu ahuu anyi ka Kristi taara, ma anyi na-ele ya anya ka onye atara ahuhu. Mana emesia, site n’apa onya ya ka anyi siri nweta nzoputa. Yabu, agbarusia ngene, agakwazi ekuru ngene nuo.

 

Ihe ogugu nke abuo(Heb 4:14-16; 5:7-9)

Uzu na amaghi akpu ogene,ya lee egbe anya n’odu. O bu site na-ahuhu na irube isi ka Jeso jiri wee zuo oke. Ebe emegoro ya o zuo oke, o buru uzo nzoputa ebebe maka ndi niile na-erubere ya isi. Ya bu, ka anyi nomie ma kwesie ike na Jeso maka nzoputa anyi.

 

Akuko maka ahuhu Jeso (Jn 18:1-19:42)

Ndi otu Kristi ibem, o buru na ikpe ma eziokwu , o buna akazu adighi ya?

Gini mere ndi  Jew jiri si na obughi nwoke a kama Barrabas? O di mma akpa ezughi ndi dibia, ofeke anyara abuo?

N’akuko maka ahuhu na onwu nke Dinwenu anyi Jeso Kristi, Jon di aso ga akowaputaraanyi maka njide, amamiikpe, uru, afufu, mkpodo n’obe , onwu na mbilite n’onwu Kristi. Ka nkea na-ga oburu na erute ebe Jeso hulatara isi kubee, anyi ga-esekpuru ala kpee ekpere nwa oge ma kulitekwa. Ya bu, ka ike ghara igwu anyi ige nti.

 

Ekpere Oha:

Ugbua, anyi ga-akwuru oto ma rio aririo di iche iche. Ukochukwu ga ekwu okwu mmalite maka aririo obula. Okwusia okwu ndia, o ga agwa anyi “ka anyi sekpuenu”. Anyi ga esekpuru ala kpee ekpere ime obi nwantiti  oge . Emesia, oga agwakwa anyi ka anyi kunienu. Ya bu, ka anyi were obi ume ala na obi loghalu elogha gosiputa ike ibu ukochukwu anyi natara na baptism site n’ikpere onwe anyi na ndiozo ekpere maka mkpa nke ahu na nke mkpuruobi.

 

Emume Isekpuru Obe Jeso

Umu chukwu, ebe o bu na etuo nna anyi ogbu ebunu, ohu agu o gbuo; ugbua, anyi ga akwadobe isekpuru obe di aso.

Ukochukwu ga-eburu obe nke ekechiri ekechi. Ndi na-agba odibo na-ebe nchuaja abuo ga-eburu oku oriona soro ya n’ihu. Ukochukwu tinyere ndi na-agba odibo ga-eburu obe a site n’azu ma biarute n’ebe nchuaja. Ukochukwu ga-anoro na mbata ulo uka were nwayo toghee akuku nke obe nke chebere ihu n’elu. O mesia nke a, o ga ekwu: leenu osisi nke obe, ebe akpogburu onye nzoputa nke uwa. Anyi ga azakwazi ya; Bianu ka anyi sekpuenu. O gakwa atoghepu akuku aka nri nke obe ma orute n’etiti ulo uka ma kwue otu udi okwu ahu. N’ikpeazu, tupu obanye n’ebe nchuaja o ga atoghepu obe niile ma kwuo otu udi okwu ahu . Anyi ncha gakwazi aza ya nke oma. Emechaa nkea, a ga-edobezi obe a n’ihu ekwu nchu aja. Ndi nchu aja ga- esekpuru obe a ugboro ato ma gazie susuo ya onu iji gosi na obu site n’obe di aso ka Jeso siri zoputa anyi. Emesia nkea onye isi emume ga ebuli obe Jeso ma kpokuo anyi ka-anyi sekpuoro Obe. Isekpuru obe a gakwazi anochi anya isusu obe onu dika anyi si emebu. Ka nkea na-aga n’ihu, ndi ukwe ga na-ekwe ukwe akporo improperia.

 

Onyinye (maka Ala Nso. ‘Holy Land’)

N’akwukwo mbu nke Samuel isi nke iri abuo na ano, usoro okwu nke iri abuo na ano, David siri naya agaghi achuru chineke aja nke agaghi eri ya ihe n’ahu. Nwa chukwu, kulie n’oche gi ngwa ngwa ka inye Chineke onyinye (maka nkwado oru na-aga n’ala nso bu Jerusalem)

Chetakwa na chineke n’ahu onye na-enye onyinye n’obi ocha n’anya. Ka onyinye a na-aga n’ihu, ukochukwu ga-ebute ahu Kristi nke agoziri anyi unyahu. Enyecha onyinye, anyi ga abanye n’agba ikpe azu: Oriri Nso. Ukochukwu ga- ebido na nna anyi noo n’eligwe. Agaghikwa enye ekele udo n’ihi na udo obula adighi maka n’onye ulo ya na-agba oku adighi achu oke.

 

Emume nke Inata Oriri Nso: Mass of the Pre-Sanctified

O bu eziokwu na-achughi Aja Misa tata mana chi kere nwa agu agaghi ekwe ka otaa ahihia.

Site na nnukwu emume a nke nkowaputagoro na mbido a na-akpo “mass of the presanctified” Ukochukwu butere anyi Oriri Nso nke a goziri unyahu. Mana anyi gakwazi ebu n’obi n’obu oge nwata jiri kwocha aka ka oga eji nweta ikikere isoro okenye rie nri. Nke a putara n’obu soso ndi Katolik kwadoro onwe ha nke oma ga-anata Oriri Nso maka na Jeso agaghi akwocha aka ma tiere okuko aki.

Ya bu, ugbua bu oge inata oriri nso, ka ndi di ocha puta nara ma rie ahu Kristi.

 

Anatachaa oriri nso: Mmechi

Dika emume tata biarutegoro na njedebe, ana echetara anyi na:

v Uka nyere ikikere isekpuru obe Jeso bido tata rute na oge aga- aka Uka abali mbilite n’onwu echi.

v Uka abali mbilite n’onwu ga-adi echi n’elekere iri nke abali. A na-echetara anyi ka anyi were oriona nke akporo ‘candle’ na bekee were bia.

v Uka mbilite n’onwu ga adikwa n’ubochi uka ma owere nkeji iri na ise gata elekere asaa nke ututu.

Anyi agaghi echefu na onye ulo ya na- agba oku , adighi achu oke. Ya bu, oburu na- emesia ugbua , ukochukwu ga ekpere ndi mmadu ekpere. Emesia nkea, ndi nchu aja ga-apu n’asighi anyi naba na missa agwusigo.

Oburu na-emesia, aga eji nwayo bia topu akwa ocha atoro n’ekwu nchuaja oge emere emume inata oriri nso.

N’ikpeazu , adighi agwa ochi nti na- agha esugo. Ya bu, agbasaa, odighi onye ga-ekwu okwu. Anyi niile ga-esoro Kristi koro n’obe, nwuo ma nwe ike isoro ya kulite. Ka anyi jisie ike maka nkwado nke paschal site n’ekpere, opipia, ncheghari, ibu onu, inyere ndi ogbenye aka na iju onwe onye.

Taa bu maka mpiwa akidi, echi ga-abu maka osisi na oriri ya. Ka emesianu!

 


Want to review or comment on this article?


Need a FREE Reader Membership?
Popular Action/Thriller Articles
  1.  PART 10 THE FACETS OF DEATH
  2.  Anomalous Mental Phenomenon (AMP) – Cl
  3.  Fill in the Blanks
  4.  Should I Trust the Police?
  5.  Criminology as Pseudoscience
  6.  The Birthday Vault
  7.  My First Pitch
  8.  Hanley (Doc) Harding
  9.  Is Ron DeSantis Obssed With Sex And It
  10.  Kissing-Up Fraud
  11.  The Birthday Vault
  12.  Patriotic Protests
  13.  Is Donald Trump trying to sever ties w
  14.  Latest review of Under the Healing Dom
  15.  The Age of Consent
  16.  Is Self-Publishing a Children’s Book t
  17.  https://readershouse.co.uk/jeanne-burr
  18.  Today is a Red-Letter Day
  19.  Ain't Life Full of Surprises
  20.  Exploring Creativity
  21.  PART 9 CHRIST IN YOU
  22.  Book Review: The River Never Speaks by
  23.  “The Transformative Power of the Virgi
  24.  Justifiable Homicide
  25.  Narcissists, Social Media, and Porn

Free Book Review Program
Select a book to read and review today!

Out of the Wilderness by Pamela Ackerson

Book 5, the final story in the Wilderness Series--A marvelous and fantastic journey, enjoy little known history crafted with original, brilliant unforgettable moments, unforgettable characters, and an unforgettable adventure that will keep you shakin  
Member BookAds

A New Leaf (Rockland PD # 3) by Trennis Killian

Lieutenant Fay Kincaid has plenty on her plate with being commander of the Rockland PD Support Division which included two of the most prestigious units there, SWAT and the Bomb Squad as well as CSU, SRO and Dispatch. Not only that, but she is the si  
Member BookAds

The Gingerbread House by Pamela Ackerson

She was quite capable of taking care of herself...She appreciated everything he was doing for her and the Grandmothers Four, but she needed his help, not for him to take over.  
Member BookAds