This poem 'Agụụ' by Izunna Okafor poetically describes hunger, as it is currently tormenting most developing and undeveloped countries, particularly in Africa, and precisely in Nigeria.
Izunna Okafor dere abụ a
Chịịị chịịị ka ọ na-atà n'afọ
Nwịị nwịị ka ọ na-amị n'ọkpụkpụ
Agụụ bụ aha ya
Ị kpọọ ụganị ọ za gị
Agụụ bụ echete ebeme
O nweghị nne, nke o ji enwe nna
O nweghịkwa ikwu na ibe
Agụụ bụ aha ya
Agụụ amaghị nwoke na nwaanyị
Ọ haghịkwà ụmụntakịrị aka
Mere e ji akpọ ya otii nwata n'ihu nne ya
Agụụ bụ aha ya
Agụụ anaghị asọ anya
Agụụ naghị eme ihere
Agụụ anaghị asị ndo
Agụụ bụ aha ya
Ọrọbọ na-atụ ya égwù
Atịngà na-agbara ya ọsọ
Dike akpụ obi na-asọkwa ya asọ
Agụụ bụ aha ya
Agụụ enweghị ényì
Agụụ enweghị onye iro
Mana ebe ọbụla ọ bàtàrà
a chọọrọ ya ihe ọ na-eri
Agụụ bụ aha ya
I mete ya enyi, ọ ka njọ
Ị tụ ya iro, ọ nyụọ gị anya
Ọ bụ orufọrọ be onye
Agụụ bụ aha ya
Agụụ na-amịkpọ mmadụ
Na-eme nwata okenye n'akaghị aka
Ma ya onwe ya adịghị aka nka
Agụụ bụ aha ya
Agụụ bụ ọnwụnwà
Agụụ na-ete mmadụ ure n'ọha
Agụụ bụkwa ọranyere nwata anya n'ogwu
Agụụ bụ aha ya.
Ọ na-adị ka ọnwụ na-egbu ọhà
Mana ọnwụ ekweghị ewere ya
Kemgbe okike ụwa ka o siri kpaba ike
Agụụ bụ aha ya
Kwashiọkọ bụ afọ ime ya
Ọnya afọ bụ òghùghù ọmụmụ nwa
N'ala ili ka ọ na-akpdobe ike
Agụụ bụ aha ya
Agụụ eriela ọtụtụ isi
Mana afọ ekweghị eju ya
Ọ bụ nke e mere jụọ oyi
Agụụ bụ aha ya
Agụụ dị njọ
Agụụ dị n'ala anyị
Agụụ ahịala ụmụ mmadụ ọnụ
Agụụ egbuo ndị a
Agụụ...
Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenatọr dị n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, onye nta akụkọ na onye nkwàlite asụsụ Igbo. Ọ gụrụ na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ ebe o mere maka ihe ọmụmụ nhazi ọhanaeze bụ 'Public Administration' n'olu bekee.
Dịka onye edemede, o nwetala ntúrú ùgò na nkwanye ùgwù karịrị iri abụọ na ise n'ihe gbasaara edemede, site n'ala anyị na n'ogoogo mba òfèsi. Nturu ùgò na nkwanye ùgwù ndị ahụ gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016; Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, Young Achievers Award/Best Young Writer of the Year 2019, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.
Dịka onye nta akụkọ, ọ na-arụ n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra, ma na-arụkwa n'ụlọ ọrụ Igbo Radio, bụ ụlọ ọrụ dị n'ikùkù ma nwee isi ngàlàbà ya na mba Canada.
Izunna na-ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo na n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa onye e jìrì ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo wee mara.
O deela akwụkwọ asatọ, ma nwekwa edemede karịrị narị asatọ n'ọnụ ọgụgụ o bipùtagòrò n'ìkùkù. Ọ bụ onye isi òtù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.
Thank you Mr. Ronald, for commenting. It is really on the increase. But the developed countries still have roles to play in assisting these poor African countries. And the poets are not left out on this.
I cannot read, but I noticed that Agụụ or Hunger is repeated many times, because it is at the heart of what you are emphasizing by repetition. The plight of the poor countries in Africa and around the world is increasing. A combination of too many children born and increasing drought and floods, the early signs of global warming, is leading to conflicts and migrations stressing food sources everywhere, but hitting the poorest the most. If a poem can change the people and make them see a way to a better life, I hope this one can.
This is a book of free verse poetry that addresses the seven main tests in life and offers some sensible solutions to passing those tests with minimal discomfort.
“The woman or man who is a poet, or fiction writer, or playwright, or all of these, is engaged constantly in a jazz ballet of vocabularies, passions, genders, histories, perspectives, death, love, and life. The music of revelation announces itself to
BEFORE DARKNESS FALLS Retails for 14.95 / but you can have it now for only 11.95 This is a book of poetry and prose that deals with real life issues that all of mankind comes to face. Some of the poems deal with the tenderness of love, while others s
Ron