AuthorsDen.com   Join | Login    
Where Authors and Readers come together!

SIGNED BOOKS    AUTHORS    BOOKS    SAMPLE CHAPTERS    AUDIOBOOKS    eBOOKS    STORIES    ARTICLES    POETRY    BLOGS    NEWS    VIDEOS    SUCCESS    TESTIMONIALS

Featured Authors:  Paul Lonardo, iArmineh Ohanian, iScott Zachary, iPeter Jessop, iPamela Ackerson, iRobert Liu, iH.G. Potter, iRoger Vizi, iChristine Boyce, iPawan Mishra, i

  Home > Poetry > Poetry        Popular: Books, Stories, Articles, Poetry        Authors: A B C D E F G H I J K L M N O P Q R S T U V W X Y Z     

Izunna Okafor

 Follow Me  

· Contact Me
· Books
· Articles
· Poetry
· News
· Events
· 38 Titles
· 17 Reviews
· Save to My Library
· Share with Friends!
·
Member Since: Nov, 2017

Izunna Okafor, click here to update your pages on AuthorsDen.



Anyammiri Ala Anyị (Tears of Our Land)
by Izunna Okafor → (All Poetry by Izunna Okafor)
Friday, April 24, 2020    Rated "G" by the Author.
Share   Print  Save   Follow   Share on Facebook


Poem Artwork

Izunna Okafor dere abụ a


Ala Naịjiria ebegbuo onwe ya n'akwa
Anya mmiri anya mmiri ebe niile
Akwa ụtụtụ, akwa ndeeri na akwa arịrị
Ọnye ga-azọ ala anyị ?

Chi ọbụbọ were aka ekpe were dupụta ya ụra
Chi ọjọọ ewere akwa arịrị dúbàà ya
Ihe na-ebenụ aka na-ebekwa
Onye ga-azọ ala anyị ?

Naịjiria bụ nne chị ụmụ
Ndị ọchịchị bụ di bi ụlọ
Nne na nwa ebegbuo onwe ha n'akwa
Agụụ, anya mmiri, akwa arịrị ebe niile
Onye ga-azọ ala anyị ?

Lekene nwaanyị na mma ya
Na ụbara ụmụ chi jiri gọzie afọ ya
Ma di ya ekweghị ka o rite ihe nwa ya
Wee na-amị ya ọbara ka anwụnta Nnewi
Onye ga-azọ ala anyị ?

Ezi na ụlọ ya nọ n'ọgbaghara
Ma di ya adịghị emezị ka nwoke
Egbe ebukọchaala ụmụ ya na Benue, Dapchi na Chibok
Ma di ya ekwughị ihe ọbụla ma ọlị
Dịka a gà-asị na ọ macha ihe na-eme
Onye ga-azọ ala anyị ?

Di ya ezugbuola ohi, ma bube ya ọnụ nri
Ụmụka nọzịkwa n'agụụ, ọbụnadị n'ikpo nri ha nwèrè
Ya bụ ògòlì nwaanyị agbaa isi awọ na-erughị eru
Anya mmiri ejugokwa ọgọdọ ya
Onye ga-azọ ala anyị ?

Nwoke ahụ agbaala ya ọtọ n'ọmà ahịa
Chaị !
Agụ nwaanyị ebegbuo onwe ya n'akwa !!
Dịka ụwa na-agbázịkwa ọtọ ya elele
Ùgwù e jiri mara ya erughịzịkwa ya aka
Onye ga-azọ ala anyị ?

Ala Naịjiria na-achọ dí ọzọ ugbu a
Ndị ọ lụrụ alụ agharịpụchaala ya
N'ihi ezughị oke n'ihe e ji nwoke eme
Nke bụ isi anaghị echètekwuzịkwa onwe ya
N'ihi ụbụrụ ịta nchara
Na ihe a gwọrọ agwọ so ya
Onye ga-achị ala anyị ?

Iwe eweela ụmụ ya ndị okenye
Ha ji achọrọ nne ha di ọzọ n'oge
Naanị nwoke nwere ùgwù na nsọpụrụ
Ka a na-elegara anya ibunye mmanya ụbọchị ahụ
Ma e wepuchaa úgwùmágànà na ndị otu ya.
A jụọ m ụnụ, onye ga-azọ ala anyị ?

Gị onwe gị sòrò bụrụ nwa ya
Mụ onwe m sòrò bụrụ nwa ya
Ngịga dị n'ọkụ abụghị nkè azụ
Ọ bụrụ nkè anụ
Ụmụnne m a jụọ m ụnụ ọzọ
Onye ga-alụ mma anyị ?

Oke ji na àbàlà ọ na-azọ ihu ọba ?
Ngwa jikere ma chemie echiche nke ọma
Ka i wee sòró anyị zaa ajụjụ ahụ n'oke ụbọchị ahụ
Onye ga-achị ala anyị ?

© Izunna Okafor

Maka Onye Dere Abụ A:

Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenatọr dị n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, onye nta akụkọ na onye nkwàlite asụsụ Igbo. Ọ gụrụ na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ ebe o mere maka ihe ọmụmụ nhazi ọhanaeze bụ 'Public Administration' n'olu bekee.

Dịka onye edemede, o nwetala ntúrú ùgò na nkwanye ùgwù karịrị iri abụọ na ise n'ihe gbasaara edemede, site n'ala anyị na n'ogoogo mba òfèsi. Nturu ùgò na nkwanye ùgwù ndị ahụ gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016; Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Dịka onye nta akụkọ, ọ na-arụ n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra, ma na-arụkwa n'ụlọ ọrụ Igbo Radio, bụ ụlọ ọrụ dị n'ikùkù ma nwee isi ngàlàbà ya na mba Canada.

Izunna na-ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo na n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa onye e jìrì ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo wee mara.
O deela akwụkwọ asatọ, ma nwekwa edemede karịrị narị asatọ n'ọnụ ọgụgụ o bipùtagòrò n'ìkùkù. Ọ bụ onye isi òtù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.

Want to review or comment on this poem?


Need a FREE Reader Membership?

New Poetry by Izunna Okafor
Popular Poetry (Poetry)
  1.  Catching Happiness...
  2.  Finding Trust Again
  3.  Nightsky
  4.  Reality of Another Kind
  5.  Spindrift
  6.  Kindness
  7.  Our Restless Minds
  8.  Luxury of Solitude
  9.  In The Still of The Night
  10.  Dream Just a Dream
  11.  Life's Enormous Green Chest
  12.  Sediment Within the Soul
  13.  Roadkill Memoriam
  14.  Hunting for Truth
  15.  Whisper Pens
  16.  In Praise of Anonymity
  17.  I Have Spent My Entire Life
  18.  Shaved Reflections
  19.  Feeling Lonely
  20.  Serrated Smiles
Free Book Review Program
Select a book to read and review today!

Petals of Love: Poetry of a Woman's Soul by Myra Darwish

From the author of Jupiter Remembered and Until It’s Time: Embracing Life In Our Later Years comes Petals of Love: Poetry of a Woman’s Soul – a heartfelt collection spanning more than thirty-five years. Through tender reflections, these poems offer g  
Member BookAds

Poetry Pages: A Collection of Voices From Around the World Volume II by Erin Kelly-Moen

A people’s heart can be found in their poetic words. In history men and women have stood firmly upon their soapboxes and street corners, rallying the deepest beliefs of people to rise up and be heard. The poetrypages.com has offered that voice a new  
Member BookAds

A Stir of Echoes by Regis Auffray

This is my third book of poetry consisting of over 300 poems that offer a glimpse into my soul.  
Member BookAds